Shade Thomas-Fahm, onye amụrụ Victoria Omọ́rọ́ník' Àdùk'́ Fọlashadé Thomas (ma a maara ya dịka "Shadé Thomas"), a na-ahụta ya dị ka "onye mbụ na-emepụta ejiji ọgbara ọhụrụ na Naijiria" na "otu n'ime ndị na-emepụta ihe kachasị mkpa n'Africa, na onye ọsụ ụzọ nke ejiji Naijiria" Ọ bụ onye mbụ na-emepụta ejiji mepere ụlọ ahịa ejiji na Naịjirịa ma mesịa mepee ọtụtụ ụlọ ahịa n'ebe dị iche iche. Shade Thomas Fahm mere ka a mara ụlọ ọrụ ejiji Naịjirịa. Mmetụta ya na ejiji Naịjirịa diri kemgbe afọ 60 ruo ugbu a, n'ime Naịjirịa na mba ofesi. "Mmasị ya na okike ya tọrọ ntọala maka ụlọ ọrụ ejiji, ebe ọ kpalikwara ọtụtụ ndị na-emepụta ihe ịchụso ihe na-amasị ha. " A ga-eme ememe mmetụta ya na-adịgide adịgide na Victoria na Albert Museum (V&A) nke London na London na 2022.
Developed by StudentB